2 Kings 21:3-5

3O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya lara nʼiyi. O wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nye Baal, pịakwa ogidi Ashera, dịka Ehab eze Izrel mere. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe,
Nke a bụ anyanwụ, ọnwa na kpakpando
feekwa ha ofufe.
4O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na Jerusalem ka m ga-etinye Aha m.” 5O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe,
Nke a bụ anyanwụ, ọnwa na kpakpando
nʼogige abụọ nke nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
Copyright information for IboBIU